Isaiah 14

1Ma Onyenwe anyị ga-emekwara Jekọb ebere;
ọ ga-ahọpụtakwa ndị Izrel ọzọ,
meekwa ka ha lọghachi bịa biri nʼala nke aka ha.
Ọtụtụ ndị ọbịa dị iche iche ga-adịnyere ha,
soro ezinaụlọ Jekọb bikọtaa ọnụ.
2Mba dị iche iche ga-enyere ha aka ịlọghachi nʼala ha,
nke Onyenwe anyị nyere ha.
Mba ndị a ga-aghọkwa ndị dị nʼokpuru ụmụ Izrel,
ghọọkwara ha ndị ohu nwoke na nwanyị.
Ụmụ Izrel ga-adọtakwa nʼagha ndị ahụ dọtara ha nʼagha na mbụ,
ma chịakwa ndị ahụ kpagburu ha nʼoge gara aga.
3Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ị pụọ site nʼihe mgbu na ihe mwute, sitekwa na ndọgbu onwe unu nʼọrụ nke ịbụ ohu unu wetaara onwe unu, 4unu ga-achị eze Babilọn ọchị sị ya, Leenụ gị.

Ahaa, lee ka i si daa gị onye na-emegbu ndị mmadụ.
Lee ka ịkpa ike gị si gwụsịa!
5Nʼihi na Onyenwe anyị anyajiela mkpara ndị na-eme ajọ ihe,
meekwa ka mkpara ndị na-achị achị,
6nke sitere nʼiwe tidasịa ndị mmadụ
na-esepụghị aka nʼiti ha ihe,
nke ji nrubiga oke nke iwe ya megbuo mba dị iche iche
ya na oke mmekpa ahụ na-enweghị nkwusi.
7Ụwa niile adaala jụ, ha enwekwaala izuike,
ha na-etipụ olu ịbụ abụ.
8Ọ bụladị osisi junipa na osisi sida niile nke Lebanọn
na-aṅụrị ọṅụ megide gị na-asị,
“Agbajiela ike gị;
ugbu a ọ dịkwaghị onye ga-esogbu anyị ọzọ.”

9Ala mmụọ na-eme mkpọtụ,
na-eche izute gị nʼọbịbịa gị;
ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị,
bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa,
ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile bilie
bụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche.
10Ha niile ga-eji otu olu zaa,
ha ga-asị gị,
“Gị onwe gị adịghịkwa ike, dịka anyị na-adịghị ike;
Ị ghọọla otu onye nʼime anyị.”
11Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị,
ka a na-elikọta nʼaja.
Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina;
ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị.

12Lee ka i si site nʼeluigwe daa,
gị kpakpando ụtụtụ, nwa chi ọbụbọ.
Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼebe mba niile nke ụwa nọ na mbụ,
ma lee ka e si mee ka ị bụrụ onye a tụdara nʼala.
13Nʼihi na i kwuru ya nʼobi gị sị,
“Aga m arịgoro nʼeluigwe,
doo ocheeze m
nʼelu kpakpando niile Chineke kere;
aga m anọdụkwa nʼugwu nzukọ,
na nsọtụ ugwu nsọ ahụ dị nʼelu elu ugwu, tụọ iwu.
14Aga m arịgo nʼebe kachasị elu nke eluigwe,
mee onwe m ka m dịrị ka Onye kachasị ihe niile elu.”
15Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili,
ruo na nsọtụ ala mmụọ.

16Ndị niile hụrụ gị na-elegide gị anya,
na-atule banyere ndụ gị, sị,
“Ọ bụ nwoke a bụ onye ahụ mere ka ụwa maa jijiji,
onye mekwara ka alaeze mee mkpọtụ.
17Ọ bụ onye a bụ onye ahụ mebiri ụwa mee ya ka ọ dị ka ọzara?
Ọ bụ ya tikpọrọ obodo ukwu ya niile,
jụkwa ịhapụ ndị ọ dọtara nʼagha ka ha laa?”

18Ndị eze mba niile dị iche iche
na-edina na nsọpụrụ nʼime ili ha.
19Ma ozu gị ka a tụpụrụ
dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji.
Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha,
na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ,
ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị.
E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ.
20A gaghị eli gị dịka e si lie ndị eze ndị ọzọ,
nʼihi na i bibiela ala gị.
I gbukwaala ndị gị.


A gaghị akpọtụkwa aha ụmụ ụmụ
ndị na-emebi iwu ọzọ.
21Dozienụ ebe a ga-anọ gbuo ụmụ ya ndị ikom,
nʼihi mmehie nke ndị bụ nna ha.
Ha agaghị ebili nweta ala ahụ,
mee ka elu ụwa jupụta nʼobodo ha niile.

22Nʼihi na mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara sị,
“Aga m ebili megide ha;
aga m esitekwa na Babilọn bipụ aha ndị fọdụrụ,
na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha.
Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
23Aga m eme ka Babilọn ghọọ ụlọ obibi nye ikwighịkwighị,
na ebe mmiri ga na-adọkọ.
M ga-eji azịza ịla nʼiyi zachapụ ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.

Amụma e buru megide Asịrịa

24 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile aṅụọla iyi kwuo sị,

“Nʼezie, dịka m si tụọ ya nʼobi m, otu a ka ọ ga-emekwa.
Ọ ga-eguzosikwa ike dịka m si zube ya.
25M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m,
nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ.
A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m,
a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.”

26Nke a bụ nzube ahụ nke ezubere maka ụwa niile;
nke a bụkwa aka ahụ esetipụrụ nʼelu mba niile dị iche iche.
27Nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ dike nʼagha, ezubela ime ya. Onye kwa pụrụ ịgbanwe nzube ya?
O setịpụla aka ya, onye pụrụ ime ka o weghachi ya azụ?

Amụma e buru megide ndị Filistia

28Amụma a bịara nʼafọ ahụ eze Ehaz nwụrụ:

29Unu aṅụrịla ọṅụ, unu ndị Filistia,
maka na mkpọrọ e ji eti unu ihe agbajiela;
Ọ bụ ezie na ọ gbajiela, ma ihe ga-esite nʼọdụdụ agwọ ahụ pụta bụ ajụala,
mkpụrụ ya ga-abụ agwọ ọjọọ, nke na-amagharị ebe niile.
30Ndị bụ nnọọ ogbenye ga-achọta ihe oriri,
ndị mkpa na-akpa ga-ebikwa nʼudo.
Ma aga m eji agụụ na ụnwụ
laa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti unu nʼiyi.

31Kwasie akwa ike gị ọnụ ụzọ ama! Tie mkpu gị obodo!
Tụọnụ oke egwu unu ndị Filistia.
Nʼihi na lee, ndị agha a zụziri azụzi si nʼugwu na-abịa imegide gị.
Ọ dịghị onye na-aga iche nʼetiti ahịrị ha.
32Ọsịsa dị aṅaa ka anyị ga-enye
ndị ozi si na mba ahụ?
Gwa ha na Onyenwe anyị emeela ka Zayọn guzosie ike.
Ọ bụkwa nʼime ya ka ndị ya e wedara nʼala ga-achọtara onwe ha ebe mgbaba.
Copyright information for IboBIU